Job 41 - Bible Nso1 Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya? 2 Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya? 3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò? 4 Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi? 5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi? 6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia? 7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya? 8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ. 9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya? 10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum? 11 Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu. 12 M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru, Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya. 13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya? Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua? 14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya? Ezé-ya di oké ujọ buruburu. 15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya. 16 Dika otù si nọ ibe-ya nso, Ifufe adighi-abà n'etiti ha. 17 Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya; Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha. 18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu, Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ. 19 N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa, Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha. 20 N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa, Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere. 21 Iku-ume-ya nāmunye icheku, Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta. 22 N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya, Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú. 23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha: O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya. 24 Obi-ya siri ike dika nkume; O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri. 25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ: Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ. 26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike; Ya na ube, na àkú, na uwe-agha. 27 Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka, Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure. 28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga: Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka. 29 Anāgu ndele n'ahihia-ọka: Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì. 30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti. 31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite: Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ. 32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ. 33 Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa, Nke emeworo nēnweghi ujọ. 34 Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu: Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria