Job 40 - Bible Nso1 Jehova we za Job, si, 2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya. 3 Job we za Jehova, si, 4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum. 5 Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ. 6 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, 7 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara. 8 Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume? 9 Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe? 10 Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi. 11 Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala. 12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha. 13 Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo. 14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi. 15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. 16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. 17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. 18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè. 19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso. 20 N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú. 21 N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti. 22 Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu. 23 Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya. 24 Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya? |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria