Job 37 - Bible Nso1 Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka, Ọ nēme kwa nkpatu pua n'ọnọdu-ya. 2 Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya, Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta. 3 N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya, Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa. 4 Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja; Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe: Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya. 5 Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube; Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha. 6 N'ihi na Ọ nāsi snow, Na oké miri-ozuzo, Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n'ala. 7 Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra; Ka madu nile O mere we mara ya. 8 Anu-ọhia we nābà n'ọ̀té-ya, Ọ nānọdu kwa n'ebe-obibi-ya. 9 N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia: Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia. 10 Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice: Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara. 11 Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji; Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya: 12 Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya, Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwu N'elu-uwa dum madu bi: 13 Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya, Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue. 14 Ṅa nti na nka, Job: Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke. 15 Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu, Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua? 16 Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe, Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe? 17 Gi onye uwe-gi nēkpo ọku, Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida. 18 Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara, Nke di ike dika enyo awuru awu? 19 Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya; Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri. 20 Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu? Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya? 21 Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé: Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha. 22 N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia: Chineke ka ebube di egwu nādikwasi. 23 Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike: N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala. 24 N'ihi ya madu nātu egwu Ya: Ọ dighi-ahu ndi nile obi-ha mara ihe. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria