Job 35 - Bible Nso1 Elaihu we nāza, si, 2 Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi? Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke? 3 Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi? Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem? 4 Mu onwem gāzaghachi gi, Gi na ndi-eyì-gi. 5 Legide elu-igwe anya, hu; Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi. 6 Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya? Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya? 7 Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya? Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi? 8 Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi; Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu. 9 N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu; Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike. 10 Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem, Onye nēnye abù ọma n'abali; 11 Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe? 12 N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza, N'ihi npako di ọjọ. 13 N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu, Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya. 14 Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya, Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya. 15 Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi, Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku; 16 N'ihi ya ka Job nāsaghepu ọnu-ya n'efu; Ọ bughi n'ọmuma-ihe ka O nēme ka okwu-ya nile ba uba. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria