Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Job 34 - Bible Nso

1 Elaihu we nāza, si,

2 Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile; Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.

3 N'ihi na nti nānwa okwu nile, Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.

4 Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé: Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.

5 N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume, Ma Chineke ewezugawo ikpém:

6 M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém? Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.

7 Òle madu di ka Job? Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,

8 Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha, O we so ndi nēmebi iwu jeghari.

9 N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara madu Mb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.

10 N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti: Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu; Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.

11 N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya, Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.

12 E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu, Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.

13 Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa? Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?

14 Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya, Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ;

15 Anu-aru nile gēkubìkọ ume, Mdu gālaghachi kwa n'ájá.

16 Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka: Ṅa nti olu okwum nile.

17 Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi? Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?

18 Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi? Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu?

19 Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.

20 N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali; Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa, Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.

21 N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu, Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.

22 Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.

23 N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ, Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.

24 O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi, Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.

25 N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha; O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.

26 Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka N'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27 N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

28 Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.

29 Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:

30 Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze, Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.

31 N'ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke, Eburuwom ahuhu, m'gaghi-eme ajọ omume ọzọ:

32 Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya: Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?

33 Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya? N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.

34 Madu ndi nwere obi gāsim, Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti:

35 Job, ọ bughi n'ọmuma-ihe ka o nēkwu, Okwu-ya nile adighi kwa n'inwe-uche.

36 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na anwa Job rue mb͕e ebighi-ebi, N'ihi na ọ nāzaghachi dika ajọ madu.

37 N'ihi na ọ nātukwasi njehie n'elu nmehie-ya, Ọ nāku aka-ya abua n'etiti ayi, Nēme kwa ka okwu-ya ba uba megide Chineke.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan