Job 32 - Bible Nso1 Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya. 2 Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke. 3 Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe. 4 Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha. 5 Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku. 6 Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara. 7 Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe. 8 N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe. 9 Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé. 10 N'ihi nka ka m'siri, Gem nti; M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem. 11 Le, echerem okwu-unu, Anamaṅa nti nghọta-unu, Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile. 12 E, anamelekwasi unu anya, Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka, Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu. 13 Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe; Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu: 14 N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem; M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya. 15 Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ: Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha. 16 M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu, N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ? 17 M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem, M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem. 18 N'ihi na ejuputaram n'okwu; Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom. 19 Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu; Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa. 20 Ka m'kwue, ka aru we dajuam; M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za. 21 Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha. 22 N'ihi na amaghm itu aha; Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria