Job 30 - Bible Nso1 Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim, Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem. 2 Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram? Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì. 3 N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa: Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga. 4 Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi; Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha. 5 Anēsi n'etiti madu chupu ha; Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori. 6 N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi, Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume. 7 N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu; N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha. 8 Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha; Apiapuwo ha n'ala. 9 Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara, M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari. 10 Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ, Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum. 11 N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala, Ha achipuwo kwa bridle n'irum. 12 N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili; Ukwum abua ka ha nupuworo, We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem. 13 Ha emebiwo uzọm, Ha bara nmebim urù, Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka. 14 Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia: N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum. 15 Ihe-egwu echighariwo imegidem, Ha nāchu ọkakam dika ifufe; Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra. 16 Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri; Ubọchi nweda-n'ala nējidem. 17 N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum, Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe. 18 Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari: Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu. 19 Ọ tubàwom n'apiti, M'we yie ájá na ntu. 20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam: Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya. 21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem. 22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì. 23 N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu. 24 N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide; Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia. 25 Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye? 26 Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara. 27 Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum. 28 Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya: Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke. 29 M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì. 30 Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku. 31 Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú, Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria