Job 28 - Bible Nso1 N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di, Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha. 2 Anēsi n'ájá eweputa ígwè, Anāwu kwa nkume ighọ ọla. 3 Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu, Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwa Nkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu. 4 O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu; Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ; Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari. 5 Ala, nime ya ka nri si aputa: Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya. 6 Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu, Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo. 7 Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi, Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya: 8 Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu, Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya. 9 Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide; Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha. 10 N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù; Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia. 11 O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri; Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè. 12 Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? 13 Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya; Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu. 14 Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di: Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam. 15 Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya, Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya. 16 Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia, Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya. 17 Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya: Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya. 18 Agaghi-ehota coral na crystal: E, nnweta amam-ihe kariri ruby. 19 Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya, Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya. 20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia? Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta? 21 N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu, Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya. 22 Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri, Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya. 23 Chineke aghọtawo uzọ-ya, Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya. 24 N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa, N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe; 25 Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù. 26 Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo, Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe: 27 Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya; O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya. 28 O we si madu, Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria