Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Job 27 - Bible Nso

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2 Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém; Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;

3 (N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem, Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)

4 N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume, Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.

5 Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume: Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.

6 Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka: Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.

7 Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu, Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.

8 N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya, Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?

9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya, Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?

10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ? Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?

11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke; M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.

12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?

13 Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ, Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.

14 Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha; Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.

15 Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu, Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

16 Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá, Dozie uwe dika urọ;

17 O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya, Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.

18 O wuwo ulo-ya dika nla, Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.

19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya; Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.

20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri; Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.

21 Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la; O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.

22 Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya: N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.

23 Madu gākuru ya aka, Ma ya ọsọ chupu ya n'ọnọdu-ya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan