Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Job 22 - Bible Nso

1 Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2 Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe? É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.

3 Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume? Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?

4 Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba, We so gi ba n'ikpé?

5 Ìhe ọjọ gi abaghi uba? Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.

6 N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu, Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.

7 I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri, I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.

8 Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa; Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.

9 I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu, Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.

10 N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu, Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,

11 Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya, Na njubiga miri nēkpuchi gi.

12 Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe? Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13 I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

14 Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ; Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.

15 Ì gēdebe uzọ ochie, Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?

16 Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi, Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:

17 Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi: Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?

18 Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe: Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

19 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:

20 Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi, Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.

21 Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo: Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.

22 Biko, nara iwu n'ọnu-Ya, Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.

23 Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo; I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.

24 Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá, Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;

25 Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi, Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.

26 N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ, I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.

27 I gāriọ Ya aririọ, Ọ gānu kwa gi; I gākwughachi kwa nkwa-gi nile.

28 I gēkwubì kwa okwu, ewe me ka o guzosiere gi ike; Ìhè gāmukwasi kwa uzọ-gi nile.

29 Mb͕e ha gēme ka i di ala, i gāsi, Nweli-elu di; Onye anya-ya ruru ala ka Ọ gāzọputa kwa.

30 Ọ gēme ka onye nābughi onye nēmeghi ihe ọjọ wepuga onwe-ya: E, o werewo idi-ọcha nke ọbu-aka-gi abua wepuga onwe-ya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan