Job 21 - Bible Nso1 Job we za, si, 2 Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu. 3 Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì. 4 Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu? Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ? 5 Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu. 6 Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum. 7 Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà? 8 Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha, Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha. 9 Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu, Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha. 10 Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie; Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime. 11 Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu, Umu-ha nēte kwa egwú. 12 Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara, Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà. 13 Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ. 14 Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ. 15 Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ? 16 Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di: Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ. 17 Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya? 18 Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori? 19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya. 20 Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile. 21 N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri, Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti? 22 Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe. 23 Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo: 24 Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi, Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri. 25 Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe. 26 Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ, Ikpuru nēkpuchi kwa ha. 27 Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike. 28 N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa? 29 Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha? 30 Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha? 31 Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya? 32 Ma agēburu onye ahu rue ílì, Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya. 33 Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ. 34 Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu? |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria