Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Job 18 - Bible Nso

1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà? Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.

3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu? Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.

4 Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?

5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu, Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.

6 Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya, Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.

7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya, Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.

8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu, Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.

9 Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu, Ọnyà gāma ya.

10 Ezobeworo ya udọ̀ n'ala, Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.

11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.

12 Agu ganāgu ume-ya, Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.

13 Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya, Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.

14 Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya; Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.

15 Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya: Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.

16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru, Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.

17 Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa, Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.

18 Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.

19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya, Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.

20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru, Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.

21 Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume, Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan