Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Job 14 - Bible Nso

1 Madu nke nwayi muru, Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.

2 Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.

3 Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi, Me ka m'so Gi ba n'ikpé?

4 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.

5 Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi, I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;

6 Lepu ya anya, ka o we kwusi, Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.

7 N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.

8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala, Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;

9 Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.

10 Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?

11 Miri esiwo n'oké osimiri la, Osimiri we tasia, takọrọ;

12 Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa: Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta, Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.

13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ, Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri, Ma asi na I kparam ókè, we chetam!

14 Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia.

15 I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi: Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.

16 N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya?

17 Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà, I we tekpue ajọ omumem ihe.

18 Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì, Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya.

19 Miri nēme ka nkume ta; Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala: Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.

20 I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la; I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.

21 Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya; Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.

22 Nání na o nēb͕u anu-aru-ya nke dikwasi ya nb͕u, Nkpuru-obi-ya nke di nime aru-ya nēru kwa újú.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan