Job 13 - Bible Nso1 Le, ihe a nile ka anyam huworo, Ntim anuwo, ghọta kwa ya. 2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem: Mu onwem abughi onye dara ada kari unu. 3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka. 4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu, Ndi-dibia efu ka unu nile bu. 5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe. 6 Biko, nurunu iru-ukam, Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum. 7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ? 8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù? 9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò? 10 Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo. 11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku? Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu? 12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu, Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu. 13 B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum? 14 N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém, Tiye kwa ndum n'ọbu-akam? 15 Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya. 16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa; N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya. 17 Nurunu okwum nile nke-ọma, Ka nkwuputam di kwa na nti-unu. 18 Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume. 19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe? N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume. 20 Nání emelam ihe abua, Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi: 21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku. 22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa; Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam. 23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem. 24 N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ? 25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji? Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ? 26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem, I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam: 27 I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum: 28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká, Dika uwe nke nla riworo. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria