Ilu 9 - Bible Nso1 Amam-ihe ewuwo ulo-ya, Ọ waputawo ogidi asa ya: 2 O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa; O dowo kwa table-ya n'usoro. 3 O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkù N'elu ebe nile di elu nke obodo, si, 4 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya, 5 Bianu, rienu nrim ufọdu, Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa. 6 Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta. 7 Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì: Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya. 8 Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya. 9 Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya. 10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. 11 N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. 12 Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya. 13 Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu; Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula. 14 Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo, 15 Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha, 16 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya, 17 Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ. 18 Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria