Ilu 7 - Bible Nso1 Nwam, debe okwu-ọnum nile, Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ. 2 Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu, Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi. 3 Ke ha na nkpisi-aka-gi nile; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi. 4 Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu; Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma: 5 Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi, N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ. 6 N'ihi na na window nke ulom N'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya; 7 M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche, M'mata n'etiti umu-ndikom, Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ, 8 Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije; 9 Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi, Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri. 10 Ma, le, otù nwanyi zutere ya Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya. 11 Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya; Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ: 12 Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu. 13 Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya: 14 Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa. 15 N'ihi nka ka m'putara izute gi, Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi. 16 Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina, Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt. 17 Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon Fesa ihe-ndinam. 18 Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile. 19 N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya: 20 Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata. 21 O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya, O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya. 22 Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede, Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya, Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya; 23 Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya; Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu, Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu. 24 Ma ub͕u a, umum, genum nti, Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum. 25 Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu, Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile. 26 N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da: E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu. 27 Uzọ nile nke ala-mọ ka ulo-ya bu, Nāridaru ime-ulo nke ọnwu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria