Ilu 30 - Bible Nso1 Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya. Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal. 2 N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula, Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere 3 Amutaghkwam amam-ihe, Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara. 4 Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara? 5 Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo: Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya. 6 Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha. 7 Ihe abua ka m'riọworo Gi; Ajulam ha tutu mu anwua: 8 Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum: 9 Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ. 10 Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya, Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi. 11 Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha. 12 Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha, Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi. 13 Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku! Anēbuli kwa mbubere-anya-ha. 14 Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu. 15 Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye. Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju, E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo: 16 Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà; Na ala afọ miri nējughi; Na ọku nke nāsighi, O b͕owo. 17 Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya. 18 Ihe atọ di nke karirim ighọta, E, anọ nke m'nāmagh: 19 Uzọ ugo n'elu-igwe; Uzọ agwọ n'elu oké nkume; Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri; Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ. 20 Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di; O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya, Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula. 21 N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji, N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu: 22 N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze; Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ; 23 N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di; Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya. 24 Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku: 25 Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku; 26 Coney bu ndi nēnweghi ume, Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu; 27 Ọ dighi eze igurube nwere, Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile; 28 Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado, Ma ihe ahu di n'ulo uku eze. 29 Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma, E, anọ di nke nēje ije nke-ọma: 30 Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile, Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu; 31 Inyinya-agha; na nkpi; Na eze, nke nbili megide ya nādighi. 32 Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi, Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ, Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi. 33 N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria