Ilu 29 - Bible Nso1 Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di. 2 Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume. 3 Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria: Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì. 4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya. 5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u. 6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa. 7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike: Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma. 8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu. 9 Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa. 10 Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì: Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya. 11 Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè: Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua. 12 Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu. 13 Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo: Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova. 14 Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi. 15 Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya. 16 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha. 17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ. 18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta: Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma. 19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti: N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza. 20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. 21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata, N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa. 22 Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne. 23 Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike. 24 Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula. 25 Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu. 26 Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia. 27 Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria