Ilu 26 - Bible Nso1 Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi, Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu. 2 Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu. 3 Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu, Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu. 4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi. 5 Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya. 6 Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu. 7 Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe: Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu. 8 Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume, Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di. 9 Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di. 10 Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga. 11 Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ. 12 Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. 13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ; Ọdum di n'amá. 14 Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya. 15 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya. 16 Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche. 17 Onye nējide nkita na nti ka ọ bu, Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya. 18 Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku, Na àkú, na ọnwu; 19 Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu? 20 Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu: Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju. 21 Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku. 22 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ. 23 Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọcha Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu. 24 Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ: 25 Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya. 26 Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya. 27 Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru. 28 Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì; Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria