Ilu 25 - Bible Nso1 Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ. 2 Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu. 3 Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya, Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha. 4 Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha, Ihe ewe putara onye nānucha ọla: 5 Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze, Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume. 6 Asọpurula onwe-gi n'iru eze, Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku: 7 N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a; Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya, Onye anya-gi abua huworo. 8 Apula ngwa ngwa ise okwu, Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya, Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere. 9 Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi, Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ: 10 Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi, Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi. 11 Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu. 12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe. 13 Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya; Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata. 14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi Ka onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu. 15 Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi, Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu. 16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi; Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya. 17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì. 18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu. 19 Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu. 20 Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu, Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di. 21 Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri; Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: 22 N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi. 23 Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa. 24 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù. 25 Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà, Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di. 26 Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu. 27 Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru. 28 Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighi Ka onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria