Ilu 23 - Bible Nso1 Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri, Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi; 2 Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi, Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu. 3 Achọsila nri utọ ya ike; Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha. 4 Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka. 5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe. 6 Erila nri nke onye nwere anya ọjọ, Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike: 7 N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di: Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ. 8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa, Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi. 9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya. 10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi; Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei: 11 N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike; Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi. 12 Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti, Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma. 13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu. 14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya, We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ. 15 Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem: 16 Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù, Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi. 17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile. 18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi. 19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe, Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ. 20 Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè: 21 N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu. 22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi. 23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta. 24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya. 25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù. 26 Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ. 27 N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu; Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu. 28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe, Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari. 29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu? Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara? 30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e; Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa. 31 Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma: 32 N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu. 33 Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi, Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu. 34 I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ. 35 Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria