Ilu 22 - Bible Nso1 Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù, Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo. 2 Ọgaranya na ob͕eye ezutewo: Onye meworo ha nile bu Jehova. 3 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. 4 Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova Bu àkù, na nsọpuru, na ndu. 5 Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya. 6 Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya. 7 Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye, Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye. 8 Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi: Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa. 9 Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi; N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike. 10 Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa; E, iru-uka na nlelì gākwusi. 11 Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya, Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua. 12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma, Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru. 13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí: N'etiti amá ka agēb͕um. 14 Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu: Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya. 15 Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ. 16 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ. 17 Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. 18 N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua. 19 Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova Ka m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi. 20 Èdetaghm i isi ihe Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma; 21 Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu, Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu? 22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama: 23 N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe. 24 Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo: 25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile, We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà. 26 Abula otù nime ndi gānara madu n'aka, Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche. 27 Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ, N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi? 28 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi, Nke nna-gi-hà kpaworo. 29 Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria