Ilu 20 - Bible Nso1 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe. 2 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya. 3 Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike. 4 N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe. 5 Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya. 6 Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya? 7 Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu. 8 Eze nke nānọkwasi n'oche ikpé Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile. 9 Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha, Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem? 10 Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù. 11 Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile, Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi. 12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ, Jehova emewo ọbuná ha abua. 13 Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ. 14 Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi: Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi. 15 Ọla-edo di, na ọtutu ruby: Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu. 16 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. 17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu. 18 Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha. 19 O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ. Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu. 20 Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri. 21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu; Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya. 22 Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi. 23 Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu; Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma. 24 N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite; Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya? 25 Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju. 26 Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe, Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha. 27 Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu, Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile. 28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze: O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya. 29 Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa. 30 Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ: Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria