Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Ilu 2 - Bible Nso

1 Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;

2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta;

3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5 Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6 N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7 O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;

8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10 N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11 Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi:

12 Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ, N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi, Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;

14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ, Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:

16 Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi, N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17 Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ, Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

18 N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu, Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.

19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata, Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:

20 Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma, Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.

21 N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa, Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.

22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan