Ilu 19 - Bible Nso1 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu. 2 Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma; Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ. 3 Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru; Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku. 4 Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì: Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ. 5 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya. 6 Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua: Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì. 7 Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari! Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe. 8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya: Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe. 9 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì. 10 Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma; Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi? 11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie. 12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di. 13 Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu. 14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu: Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka. 15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu. 16 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya: Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu. 17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya. 18 Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua. 19 Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ. 20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti, Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi. 21 Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike. 22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha. 23 Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya. 24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa, Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya. 25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche: Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma. 26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere. 27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari. 28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò: Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe. 29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria