Ilu 14 - Bible Nso1 Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya. 2 Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya. 3 N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha. 4 Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha: Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi. 5 Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha: Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume. 6 Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe. 7 Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya. 8 Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ. 9 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di. 10 Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya. 11 Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku. 12 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu. 13 Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u; Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú. 14 Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu. 15 Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya. 16 Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi. 17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì. 18 Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi. 19 Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu; Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume. 20 Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu. 21 Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu. 22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe. 23 Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ. 24 Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ. 25 Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu: Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ. 26 N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà. 27 Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. 28 N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di: Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di. 29 Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ. 30 Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu. 31 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu. 32 Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu. 33 N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya. 34 Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu. 35 Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria