Ilu 1 - Bible Nso1 Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel: 2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti; Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta; 3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche, Na ezi omume na ikpé na izi-ezi; 4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù: 5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu: 6 Ighọta ilu, na okwu miri emi; Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha. 7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma: Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya. 8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: 9 N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi. 10 Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà, Ekwela. 11 Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu; 12 Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ, Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù; 13 Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta, Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha; 14 Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi; Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ: 15 Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha: 16 N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara. 17 N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula: 18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha. 19 Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di; Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu. 20 Amam-ihe nēti nkpu n'èzí; N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà; 21 N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù; N'oghere ọnu-uzọ-ama nile, N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile: 22 Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì? 23 Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile. 24 N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju; Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti; 25 Unu we wezuga ndum-ọdum nile, Unu achọghi kwa iba-nbam: 26 Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì; M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia; 27 Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu. 28 Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza; Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam: 29 N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì, Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara: 30 Ha achọghi ndum-ọdum; Ha lelìri iba-nbam nile: 31 Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ. 32 N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha, Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì. 33 Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria