Diuteronomi 5 - Bible Nso1 Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Israel, nurunu ukpuru ndia na ikpé ndia nke mu onwem nēkwu na nti-unu ta, ka unu we muta ha, lezi kwa anya ime ha. 2 Jehova, bú Chineke-ayi, b͕ara ndu nye ayi nime Horeb. 3 Ọ bughi nna-ayi-hà ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu a nye, kama ọ bu ayi, ọbuná ayi onwe-ayi, ndi nọ n'ebe a na ndu ta, ayi nile. 4 Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, 5 (mu onwem nēguzo n'etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n'ihi na unu turu egwu n'ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n'ugwu ahu;) si, 6 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta. 7 Gi enwela chi ọzọ tiyerem. 8 Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: 9 gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; 10 ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. 11 Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi. 12 Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu. 13 Ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: 14 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu. 15 I gēcheta kwa na i buri orù n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n'ebe ahu puta: n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike. 16 Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi. 17 Gi eb͕ula madu. 18 Gi akwa-kwa-la iko. 19 Gi ezu-kwa-la ori. 20 Gi ab͕a-kwa-la àmà ugha megide madu-ibe-gi. 21 Gi enwe-kwa-la anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere. 22 Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem. 23 O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n'etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu; 24 unu we si, Le, Jehova, bú Chineke-ayi, emewo ka ayi hu ebube-Ya na idi-uku-Ya, ọ bu kwa olu-Ya ka ayi nuru site n'etiti ọku ahu; ta ka ayi huworo na Chineke nākpayere madu uka, ọ di kwa ndu. 25 Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka ayi gānwu? n'ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa. 26 N'ihi na ònye di n'etiti anu-aru nile, nke nuworo olu Chineke di ndu ka O nēkwu okwu site n'etiti ọku, dika ayi nuru, ọ di kwa ndu? 27 Gi onwe-gi jerue nso, nu kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gēkwu: gi onwe-gi gāgwa kwa ayi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāgwa gi; ayi gānu kwa, me ya. 28 Jehova we nu olu okwu nile unu, mb͕e unu gwaram okwu; Jehova we sim, Anuwom olu okwu nile nke ndi nka, nke ha gwaworo gi: ha emewo nke-ọma n'ihe nile ha kwuworo. 29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi! 30 Je, si ha, Laghachirinu onwe-unu n'ulo-ikwū-unu. 31 Ma gi onwe-gi, guzo n'ebe a n'akukum, ka M'gwa kwa gi ihe ahu nile M'nyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n'ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya. 32 Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. 33 N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria