Diuteronomi 32 - Bible Nso1 Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum: 2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú: 3 N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku. 4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu: N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi: Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu. 5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ. 6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a, Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe? Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike. 7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi. 8 Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha, Mb͕e O kesara umu madu, O guzoro ókè nile nke ndi nile Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di. 9 N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya. 10 Ọ chọtara ya n'ala ọzara, Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja. Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe, Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya: 11 Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya, Nērughari n'elu umu-ya, Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha, Nēbu ha n'elu nkù-ya: 12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya, Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya. 13 Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú; 14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine. 15 Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu. 16 Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo, Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe. 17 Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke, Bú chi ha nāmaghi, Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata, Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ. 18 Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi. 19 Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom. 20 O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ, M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha: N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu, Umu ndi nēkwesighi okwukwe. 21 Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo; Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe: Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo; Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe. 22 N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku. 23 M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha: 24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo, Ya na nbipu di ilu; Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha, Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá. 25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ. 26 Asiwom, M'gāfupu ha, Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu: 27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile. 28 N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu, Nghọta adighi kwa nime ha. 29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha! 30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ? 31 N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi, Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe. 32 N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, Site kwa n'ubi Gọmọra: Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí, Uyọkọ di ilu ka ha nwere: 33 Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu, Na ńsí di irè nke aju-ala. 34 Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm? 35 Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa. 36 N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya, Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya; Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo, Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru. 37 Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya; 38 Nke nēri abuba àjà nile ha, Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha; Ka ha bilie, yere unu aka, Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu. 39 Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam. 40 N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe, We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi, 41 Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà, O buru kwa na akam ejide ikpé; M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem, M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi. 42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè, Mma-agham gēri kwa anu-aru; Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha, Site n'isi ndundu onye-iro. 43 Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu: N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya, Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya, O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya. 44 Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun. 45 Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia: 46 o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. 47 N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya. 48 Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si, 49 Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe: 50 gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ: 51 n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel. 52 N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria