Aịzaya 23 - Bible Nso1 Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya. 2 Derenu du, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu; gi onye ndi-ahia Zaidon, bú ndi nāgabiga oké osimiri, mejuworo ihe. 3 N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche. 4 Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè. 5 Mb͕e anuru ihe a n'Ijipt, ihe anuru bayere Taia gēme ka ha b͕alie. 6 Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu. 7 Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n'ebe di anya inọ dika ọbìa? 8 Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa? 9 Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa. 10 Rùbiga n'etiti ala-gi dika Nail, gi ada Tashish; ihe-ike-n'úkwù adighi kwa ọzọ. 11 Aka-Ya ka O setiworo n'elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile. 12 O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe. 13 Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada. 14 Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish: n'ihi na ebibiwo ebe siri ike unu. 15 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēchezọ Taia ọgu arọ atọ na iri, dika ubọchi nile nke otù eze si di: mb͕e ọgu arọ atọ na iri ahu gwusiri ọ gādiri Taia dika abù nwanyi nākwa iko. 16 Were ubọ-akwara, jegharia n'obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi. 17 Ọ gēru kwa, mb͕e ọgu arọ atọ na iri gwusiri, na Jehova gēleta Taia, o we lata n'onyinye-ikwa-iko-ya, ya na ala-eze nile nke uwa nke di n'elu uwa ewe kwa iko. 18 Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria