Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 99 - Bible Nso

1 Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji: Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.

2 Jehova di uku nime Zaion; Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.

3 Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya: Onye nsọ ka Ọ bu.

4 Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya; Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.

5 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di: Onye nsọ ka Ọ bu.

6 Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya; Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.

7 N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu: Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.

8 Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha: Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha, Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,

9 Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di; N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan