Abụ Ọma 98 - Bible NsoAbù Ọma. 1 Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa. 2 Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya. 3 O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi. 4 Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma. 5 Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma; Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma. 6 Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova. 7 Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya; 8 Ka osimiri nile kua aka-ha; Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù; 9 N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria