Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 96 - Bible Nso

1 Bùkuenu Jehova abù ọhu: Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.

2 Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

3 Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

4 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.

5 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe.

6 Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.

7 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.

9 Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ: Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.

10 Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.

11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;

12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya; Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;

13 N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan