Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 94 - Bible Nso

1 Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.

2 Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa: Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.

3 Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu, Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?

4 Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu: Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.

5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova, Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.

6 Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.

7 Ha we si, Ja agaghi-ahu, Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.

8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel: Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?

9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe? Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?

10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba, Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?

11 Jehova mara èchìchè madu, Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.

12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;

13 Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ, Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.

14 N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

15 N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume: Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.

16 Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ? Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?

17 Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka, Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.

18 Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.

19 Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

20 Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile, Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?

21 Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.

22 Ma Jehova aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.

23 O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha, Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha; Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan