Abụ Ọma 93 - Bible Nso1 Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe; Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n'úkwù: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya. 2 Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie: Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ. 3 Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova, Osimiri eweliwo olu-ha; Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu. 4 Kari olu nile nke ọtutu miri, Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri, Jehova Nke nọ n'ebe di elu di ebube. 5 Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku: N'ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma, Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria