Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 91 - Bible Nso

1 Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

2 M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

3 N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.

4 Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba: Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

5 I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;

6 Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.

7 Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8 Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide, We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9 N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10 Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11 N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi, Idebe gi n'uzọ-gi nile.

12 N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13 Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

14 N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa: M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.

15 Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.

16 Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya, M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan