Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 90 - Bible Nso


Ekpere Moses, Bú onye nke Chineke.

1 Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi N'ọb͕ọ nile.

2 Tutu amuputa ugwu, Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi, Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.

3 I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu.

4 N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-Gi Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga, Na dika otù nche n'abali.

5 I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.

6 N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó; N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.

7 N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi, Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji.

8 I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi, I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi.

9 N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi: Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume.

10 Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.

11 Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?

12 Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

13 Lata, Jehova; rùe ole mb͕e? Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi.

14 Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n'ututu; Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile.

15 Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha, Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha.

16 Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi, Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n'aru umu-ha.

17 Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi; E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan