Abụ Ọma 89 - Bible NsoMaschil Itan, bú onye-Ezrahait. 1 Ebere nile nke jehova ka m'gābù abù-ha rue mb͕e ebighi-ebi: Ọb͕ọ nile ka m'gēwere ọnum me ka ha mara ikwesi-ntukwasi-obi-Gi. 2 N'ihi na asiwom, Rue mb͕e ebighi-ebi ka agēwuli ebere elu dika ulo; Elu-igwe, I gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi guzosie ike nime ha. 3 Mu na onye M'rọputara ab͕awo ndu, Aṅuworom Devid, bú orùm, iyi; 4 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah 5 Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ. 6 N'ihi na ònye nime mbara-ígwé ka agēji turu Jehova? Ònye yiri Jehova n'etiti umu Chineke? 7 Ọ bu Chineke Nke anāmara jijiji ri nne n'ìzù nzuzo nke ndi nsọ, Ọ bu kwa Onye anātu egwu Ya kari ndi nile di Ya buruburu. 8 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Ònye di ike dika Gi, Ja? Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di kwa Gi buruburu. 9 Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua. 10 Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u; I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi. 11 Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa: Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha. 12 Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi. 13 Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu. 14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi. 15 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije. 16 N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile: Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu. 17 N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu: Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu. 18 N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi; Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi. 19 Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu. 20 Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya: 21 Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ; Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume. 22 Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala. 23 M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya, Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe. 24 Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya: Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu. 25 M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri, Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile. 26 Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam. 27 Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ. 28 Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem, Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi. 29 M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe. 30 Ọ buru na umu-ya arapu iwum, Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile; 31 Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ, Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu; 32 M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha. 33 Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem, M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim. 34 M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ, Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta. 35 Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi; M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli; 36 Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi, Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum. 37 Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah 38 Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju. I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè. 39 I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi: I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala. 40 I tiwawo ogige-ya nile; I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia. 41 Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe: Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta. 42 I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu; I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria. 43 Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu, I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha. 44 I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi, I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala. 45 I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia: I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah 46 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku? 47 Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu: Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye? 48 Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah 49 Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi, Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi? 50 Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi; Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba; 51 Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova, Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta. 52 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria