Abụ Ọma 88 - Bible NsoAbù, bú Abù Ọma Umu Kora; nke diri Onye-isi Abù; n'elu Mahalath Leannoth. Maschil Himan, bú onye-Ezrahait. 1 Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi: 2 Kwe ka ekperem bata n'iru Gi; Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum: 3 N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim, Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ. 4 Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike: 5 Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya, Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì, Ndi I nēchetaghi ọzọ; Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi. 6 I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala, N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi. 7 Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah 8 I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí. 9 Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ. 10 Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu? Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah 11 Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì? Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì? 12 Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri? Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe? 13 Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova, Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi. 14 Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim? N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi? 15 Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata: Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri. 16 Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim; Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom. 17 Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile; Ha ab͕awom buruburu n'otù. 18 I mewo ka onye nāhum n'anya na eyìm nọm n'ebe di anya, Ndi m'mara nke-ọma ka ọchichiri bu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria