Abụ Ọma 87 - Bible NsoAbù Ọma umu Kora; Abù. 1 Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile. 2 Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob. 3 Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi, Obodo Chineke. Selah 4 M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram: Le Filistia na Taia, ha na Etiopia; Nka ka amuru n'ebe ahu. 5 Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya; Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike. 6 Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si, Nka ka amuru n'ebe ahu. Selah 7 Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria