Abụ Ọma 85 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma umu Kora. 1 Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ: I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata. 2 I bupuwo ajọ omume ndi-Gi, I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah 3 I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi: I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi. 4 Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi, Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi. 5 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe? Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile? 6 Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ: Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi? 7 Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi, Nye kwa ayi nzọputa-Gi. 8 M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu. 9 Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya; Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi. 10 Ebere na ezi-okwu ezutewo; Ezi omume na udo esutuwo ọnu. 11 Ezi-okwu nēpú epú n'ala; Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya. 12 Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe; Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya. 13 Ezi omume gāga n'iru Ya; Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria