Abụ Ọma 81 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma nke Esaf. 1 Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ: Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike. 2 Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une. 3 Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi. 4 N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere. 5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya, Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt: Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu. 6 Ewezugaram ubu-ya n'ibu: Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga. 7 Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah 8 Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi: Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti! 9 Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ. 10 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa: Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya. 11 Ma ndim egeghi nti olum; Israel ekweghikwam. 12 M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha. 13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti, Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile! 14 Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala, Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam. 15 Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya: Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi. 16 Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat: Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria