Abụ Ọma 80 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim Eduth. Abù Ọma nke Esaf. 1 Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè. 2 N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi, Je izọputa ayi. 3 Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. 4 Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi? 5 I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri, I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku. 6 I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù: Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha. 7 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi. 8 I si n'Ijipt ropu osisi vine: I nāchupu mba di iche iche, we kua ya. 9 I doziri ọnọdu n'iru ya, O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu. 10 Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile, Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke. 11 Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri, Wasa kwa ome-ya rue Osimiri. 12 N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile, Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya? 13 Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya, Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya. 14 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi: Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a, 15 Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo, Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume. 16 Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya: Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì. 17 Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume. 18 Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu: Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku. 19 Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria