Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 79 - Bible Nso


Abù Ọma Esaf.

1 Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi; Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ; Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.

2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri, Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.

3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem; Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.

4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5 Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi? Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6 Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7 N'ihi na ha eripiawo Jekob, Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8 Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi: Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi: N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9 Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi: Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.

10 N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.

11 Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi; Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;

12 Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa, Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.

13 Ayi onwe-ayi, bú ndi-Gi na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-gi, Gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi; Ọb͕ọ nile ka ayi gākọrọ akukọ otuto-Gi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan