Abụ Ọma 77 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jeduthun si abù abù. Abù Ọma Esaf. 1 Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu; Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti. 2 N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya. 3 M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku: M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah 4 I jidere ndi-nche nke anyam abua: Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu. 5 Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie, Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si, 6 M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali: M'gēso obim tughari uche; Mọm we chọsie ike, si, 7 Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju? Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ? 8 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile? 9 Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke? Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah 10 M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu. 11 M'gēhota omume nile nke Ja; N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie. 12 M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile, Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi. 13 Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di: Ònye bu chi uku dika Chineke? 14 Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu: I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche. 15 I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi, Bú umu Jekob na Josef. Selah 16 Miri huru Gi, Chineke; Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u: Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji. 17 Igwe-oji nile wupuru miri; Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà: Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari. 18 Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji. 19 N'oké osimiri ka uzọ-Gi di, Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri, Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile. 20 I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria