Abụ Ọma 74 - Bible NsoMaschil Esaf. 1 Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi? 2 Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo. 3 Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ. 4 Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama, 5 Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku N'alùghi-ulù nke osisi. 6 Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù. 7 Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ. 8 Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù: Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala. 9 Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru. 10 Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi? 11 N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia. 12 Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa 13 Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri. 14 Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi, I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku. 15 Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ. 16 Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu. 17 Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ: Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha. 18 Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta, Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi. 19 Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi: Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi. 20 Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi: N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike. 21 Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere: Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi. 22 Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe: Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile. 23 Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi: Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria