Abụ Ọma 73 - Bible NsoAbù Ọma Esaf. 1 N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ, Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ. 2 Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha; Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu. 3 N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu. 4 N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba. 5 Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile. 6 N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe. 7 Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè. 8 Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ: Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu. 9 Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe, Ire-ha nējeghari kwa n'uwa. 10 N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a, Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ. 11 Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu? 12 Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù. 13 Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ; 14 Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu. 15 Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a; Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori. 16 M'we chè èchìchè imata nka, Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam; 17 Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke, Ghọta ikpe-azu-ha. 18 N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ. 19 Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche. 20 Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya. 21 N'ihi na obim nāb͕ari uka, Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua. 22 Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe; Nání anu ka m'buworo n'iru Gi. 23 Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim. 24 I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram. 25 Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa. 26 Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi. 27 N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko. 28 Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria