Abụ Ọma 69 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim. Abù Ọma nke Devid. 1 Zọputam, Chineke; N'ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim. 2 Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di: Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m. 3 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem. 4 Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu: Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha: Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike. 5 Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ; Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile. 6 Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha: Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel. 7 N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta; Ihere ekpuchiwo irum. 8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ, Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ. 9 N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom; Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam. 10 M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim, O we ghọrọm nání ihe-ita-uta. 11 Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem, M'we ghọrọ ha ilu. 12 Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem; Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara. 13 Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ: Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi. 14 Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe. Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi. 15 Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum, Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam; Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya. 16 Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru. 17 Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi; N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam. 18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya: N'ihi ndi-irom b͕aputam. 19 Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem: N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ. 20 Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike: M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula; M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula. 21 Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka. 22 Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu; Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà. 23 Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ; Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile. 24 Wukwasi ha iwe-Gi, Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru. 25 Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha. 26 N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo; Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ. 27 Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha: Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi. 28 Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu, Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ. 29 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu. 30 M'gēji abù to aha Chineke, M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku. 31 Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi, Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa. 32 Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri: Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu. 33 N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye, Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya. 34 Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha. 35 N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya. 36 Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya; Ndi nāhu aha-Ya n'anya gēbi kwa nime ya. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria