Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 67 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma, Abù.

1 Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah

2 Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.

3 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

4 Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù: N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi, Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah

5 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

6 Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.

7 Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan