Abụ Ọma 66 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù, bú Abú Ọma. 1 Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile: 2 Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma: Menu ka otuto-Ya di nsọpuru. 3 Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi. 4 Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah 5 Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ. 6 Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu. 7 O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah 8 Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya: 9 Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha. 10 N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha. 11 I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi. 12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè. 13 M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi, 14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim. 15 Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi, Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu; M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah 16 Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim. 17 Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem. 18 Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum: 19 N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem. 20 Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria